Amos 7

Igurube, ọkụ na ihe ịtụ mgbidi

1Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị mere ka m hụ. Lee, ọ na-akwado igwe igurube nke ga-abịa bibie ihe ubi niile ga-etopụta mgbe e burula ụzọ wee ihe ubi nke mbụ nke a na-enye eze, dịka ihe ruuru ya. 2Mgbe ha tachara ahịhịa niile dị nʼala ahụ, etiri m mkpu: “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko arịọọ m gị, gbaghara. Jekọb ọ ga-esi aṅa guzosie ike? Lee, ọ dịkarịrị nta.”

3 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a.

Onyenwe anyị kwuru sị, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”

4Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m: Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-akpọku ọkụ iji ya kpee ikpe. Ọkụ ahụ repịara ogbu mmiri, repịakwa ala ahụ niile. 5Mgbe ahụ, asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, arịọọ m gị kwụsị! Olee otu Jekọb ga-esi guzosie ike? Lee na ọ dịkarịrị nta!”

6 Onyenwe anyị chegharịrị banyere ihe ndị a.

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Ihe dị otu a agaghị emekwa.”

7Nke a ka o gosiri m, lee, Onyenwe anyị na-eguzo nʼakụkụ mgbidi nke e ji ihe ịtụ mgbidi tụọ nke ọma, o jikwa ihe ịtụ mgbidi nʼaka ya. 8Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?”

Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.”

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.

9“Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi,
ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu,
aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.”

Emọs na Amazaya

10Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta. 11Nke bụ ihe Emọs nọ na-asị,

“ ‘Jeroboam aghaghị ịnwụ site na mma agha,
Izrel aghakwaghị isite nʼala amụrụ ha jee biri nʼala ọzọ,
dịka ndị a dọtara nʼagha.’ ”
12Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị. 13Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.”

14Mgbe ahụ, Emọs zaghachiri Amazaya, “Ọ dịghị mgbe m bụ onye amụma, abụkwaghị m nwa onye amụma, kama abụ m onye na-elekọta igwe ewu na atụrụ, na onye ọrụ na-azụ osisi sikamọ. 15Ma Onyenwe anyị sitere nʼebe ịzụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta m, Onyenwe anyị sịrị m: ‘Gaa buoro ndị m Izrel amụma.’ 16Nʼihi ya, ugbu a nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma unu na-asị,

“ ‘Ebula amụma megide Izrel,
ekwukwala okwu megide ụlọ Aịzik.’
17“Ya mere, otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Nwunye gị ga-aghọ nwanyị na-agba akwụna nʼime obodo.
Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwanyị ka a ga-eji mma agha gbuo.
A ga-atụ ala gị nʼihe ọtụtụ, kewasịa ya nye ndị ọzọ,
ma gị onwe gị ga-anwụ nʼala rụrụ arụ.
A ghakwaghị ịdọta Izrel nʼagha
mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ.’ ”
Copyright information for IboBIU